21Ọ bụrụ na ndị agha unu ga-eso gafee nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan, soro ndị ọzọ buo agha tutu ruo mgbe Onyenwe anyị chụpụchara ndị iro ya niile,
22mgbe ahụ, e merichaa mba ndị ahụ niile nʼihu Onyenwe anyị, unu nwere ike ịlọghachi nʼebe a, bụrụ ndị ikpe na-amaghị nʼebe Onyenwe anyị na ndị Izrel nọ. Ala a dị nʼọwụwa anyanwụ, ga-abụ ihe nketa unu nwere site nʼaka Onyenwe anyị.
23“Ọ bụrụkwanụ na unu ajụ ime dịka unu kwuru, mgbe ahụ, ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-emehie megide. Matakwanụ na unu ga-emesịa nata ụgwọ ọrụ mmehie unu.
24Wuonụ obodo ebe ndị inyom na ụmụ unu ga-ebi, wuokwanụ ụlọ anụ maka igwe ewu na atụrụ unu, ma mezuokwanụ ihe niile unu kweere na nkwa.”
25Ndị ebo Gad na Ruben sịrị Mosis, “Anyị bụ ndị ohu gị ga-eme dịka onyenwe anyị nyere nʼiwu.