23“Ọ bụrụkwanụ na unu ajụ ime dịka unu kwuru, mgbe ahụ, ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-emehie megide. Matakwanụ na unu ga-emesịa nata ụgwọ ọrụ mmehie unu.
24Wuonụ obodo ebe ndị inyom na ụmụ unu ga-ebi, wuokwanụ ụlọ anụ maka igwe ewu na atụrụ unu, ma mezuokwanụ ihe niile unu kweere na nkwa.”
25Ndị ebo Gad na Ruben sịrị Mosis, “Anyị bụ ndị ohu gị ga-eme dịka onyenwe anyị nyere nʼiwu.
26Ụmụ anyị niile, na ndị inyom anyị niile, na igwe ewu na atụrụ anyị, na ehi anyị niile, ga-anọ nʼebe a, nʼobodo ndị a anyị wuru nʼala Gilead.
27Ma anyị, ndị ohu gị, ndị niile tozuru ije agha, ga-agafe osimiri Jọdan ibu agha nʼihu Onyenwe anyị, dịka onyenwe anyị si kwuo.”