36Bet-Nimra na Bet-Haran bụ obodo e wusiri ike, wukwaara igwe ewu na atụrụ ha ụlọ anụ nʼime ya.
37Ma ndị ebo Ruben wugharịrị obodo ndị a: obodo Heshbọn, Eleale, Kiriatem,
38Nebo na Baal-Meon (ma a gbanwere aha ha) na Sibma. Ha gbanwere aha obodo niile ndị ahụ ha wugharịrị, gụọ ha aha ọhụrụ.
39Ndị agbụrụ Makia, nwa Manase gara nʼobodo Gilead lụgbuo ya, chụpụ ndị Amọrait bi nʼebe ahụ.
40Ya mere, Mosis were obodo Gilead nye Makia, ụmụ Manase ka ha biri nʼebe ahụ.