38Nebo na Baal-Meon (ma a gbanwere aha ha) na Sibma. Ha gbanwere aha obodo niile ndị ahụ ha wugharịrị, gụọ ha aha ọhụrụ.
39Ndị agbụrụ Makia, nwa Manase gara nʼobodo Gilead lụgbuo ya, chụpụ ndị Amọrait bi nʼebe ahụ.
40Ya mere, Mosis were obodo Gilead nye Makia, ụmụ Manase ka ha biri nʼebe ahụ.
41Jia, onye sikwa nʼebo Manase gara buso ọtụtụ obodo nta ndị ọzọ agha, lụgbuo ha. Ọ gbanwere aha obodo nta ndị a, gụọ ha Havọt Jaịa.
42Nʼoge a kwa, otu nwoke a na-akpọ Nọba duuru ndị agha gaa nʼobodo Kenat, na nʼobodo nta ndị ọzọ gbara ya gburugburu, lụgbuo ha, bichie nʼime ha. Ọ gbanwere aha obodo ndị ahụ niile bido ịkpọ ha Nọba, nke bụ aha ya onwe ya.