Ọnụọgụgụ 34

“Nye ndị Izrel iwu sị ha, ‘Mgbe unu banyere nʼala Kenan, ndị a bụ oke ala ndị ahụ unu ga-enweta dịka ihe nketa unu:

Numbers 34:2 (UKJV) Command the children of Israel, and say unto them, When all of you come into the land of Canaan; (this is the land that shall fall unto you for an inheritance, even the land of Canaan with the coasts thereof:)

1Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,

2“Nye ndị Izrel iwu sị ha, ‘Mgbe unu banyere nʼala Kenan, ndị a bụ oke ala ndị ahụ unu ga-enweta dịka ihe nketa unu:

3“ ‘Oke ala unu nʼakụkụ ndịda ga-etinyetụ aka nʼọzara Zin. Ala unu na ala ndị Edọm ga-enwekọ oke ala. Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, oke ala ndịda unu ga-ebido na ngwụcha Osimiri Nnu,

4gafee ndịda Akrabim, gabiga ruo ọzara Zin, gbada ndịda ruo Kadesh Banea. Site nʼebe ahụ ọ ga-aga ruo Haza Ada, gafee ruo Azmọn,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.