3Obodo ndị a ga-abụrụ ha ebe obibi, ma ala niile gbara ha gburugburu ga-abụ ebe ịta nri nke igwe ehi na atụrụ, na anụ ụlọ ha niile.
4“Ala ebe ịta nri nke obodo niile nke unu ga-enye ndị Livayị ga-adị narị mita anọ na ọkara nʼogologo site na mgbidi obodo ga gburugburu mgbidi obodo ọbụla.
5Ya mere nʼobodo ndị Livayị ọbụla, ala ịzụ anụ ụlọ ga-adị narị mita anọ na ọkara site na mgbidi ha ruo nʼoke ala ha. Ọ ga-adị narị mita anọ na ọkara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, narị mita anọ na ọkara nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, narị mita anọ na ọkara nʼakụkụ ugwu, narị mita anọ na ọkara nʼakụkụ ndịda. Obodo ha ga-adịkwa nʼetiti ala ịzụ anụ ụlọ ndị a.
6“Obodo isii nʼime obodo ndị ahụ unu na-enye ndị Livayị ga-abụ obodo mgbaba, ebe onye ọbụla gburu mmadụ na-amaghị ama nwere ike gbaga izere ndụ ya. Tinyere obodo ndị a unu ga-enyekwasị ha iri obodo anọ na abụọ ọzọ.
7Ya mere obodo niile a ga-enye ndị Livayị ga-adị iri obodo anọ na asatọ, tinyere obosara ala ịzụ igwe ewu na atụrụ nke gbara obodo ndị a gburugburu.