6“Obodo isii nʼime obodo ndị ahụ unu na-enye ndị Livayị ga-abụ obodo mgbaba, ebe onye ọbụla gburu mmadụ na-amaghị ama nwere ike gbaga izere ndụ ya. Tinyere obodo ndị a unu ga-enyekwasị ha iri obodo anọ na abụọ ọzọ.
7Ya mere obodo niile a ga-enye ndị Livayị ga-adị iri obodo anọ na asatọ, tinyere obosara ala ịzụ igwe ewu na atụrụ nke gbara obodo ndị a gburugburu.
8Obodo unu na-enye ndị Livayị site nʼihe nketa ndị Izrel ga-abụ dịka unu si keta oke unu. A ga-esite nʼaka ebo nwere ọtụtụ obodo wepụta ọtụtụ obodo, ma site nʼaka ebo obodo ha nwere na-ehighị nne wepụta ole na ole.”
9Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
10“Gwa ndị Izrel sị ha, ‘mgbe unu gafere Jọdan banye nʼala Kenan,