Ọnụọgụgụ 4

Nke a bụ ọrụ dịịrị ikwu Geshọn nʼụlọ nzute. Ha ga-anọ nʼokpuru Itama, nwa Erọn, onye nchụaja, onye bụ onyeisi ha.

Numbers 4:28 (UKJV) This is the service of the families of the sons of Gershon in the tabernacle of the congregation: and their charge shall be under the hand of Ithamar the son of Aaron the priest.

26Ha ga-ebukwa akwa mgbochi niile e ji gechie ogige ahụ, akwa e ji gechie ọnụ ụzọ ama ogige gbara ebe ịchụ aja na ụlọ nzute ahụ gburugburu, ụdọ ya niile na ngwongwo niile e ji eje ozi.

27Ọrụ ha niile, maọbụ ibu ihe ma ọ bụkwanụ ịrụ ọrụ ọzọ, ga-abụ site na ntụziaka Erọn na ụmụ ya. Ị ga-ekenye ha ọrụ dịrị ha nʼihe niile bụ ihe ha ga-ebu.

28Nke a bụ ọrụ dịịrị ikwu Geshọn nʼụlọ nzute. Ha ga-anọ nʼokpuru Itama, nwa Erọn, onye nchụaja, onye bụ onyeisi ha.

29“Gụọ, chọpụta ọnụọgụgụ ụmụ Merari dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.

30Chọpụta ọnụọgụgụ ndị ikom ole ha dị, ndị gbara iri afọ atọ ruo iri afọ ise, ndị toruru ịrụ ọrụ nʼụlọ nzute Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.