Ọnụọgụgụ 4

Chọpụta ọnụọgụgụ ndị ikom ole ha dị, ndị gbara iri afọ atọ ruo iri afọ ise, ndị toruru ịrụ ọrụ nʼụlọ nzute Onyenwe anyị.

Numbers 4:30 (UKJV) From thirty years old and upward even unto fifty years old shall you number them, every one that enters into the service, to do the work of the tabernacle of the congregation.

28Nke a bụ ọrụ dịịrị ikwu Geshọn nʼụlọ nzute. Ha ga-anọ nʼokpuru Itama, nwa Erọn, onye nchụaja, onye bụ onyeisi ha.

29“Gụọ, chọpụta ọnụọgụgụ ụmụ Merari dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.

30Chọpụta ọnụọgụgụ ndị ikom ole ha dị, ndị gbara iri afọ atọ ruo iri afọ ise, ndị toruru ịrụ ọrụ nʼụlọ nzute Onyenwe anyị.

31Ije ozi ha dịka o si metụta ọrụ ụlọ nzute bụ ibu mbudo ụlọ nzute ahụ niile, osisi ntụbichi ya niile, ogidi osisi na ụkwụ ya niile;

32tinyere ogidi osisi niile dị ogige ahụ gburugburu na ụkwụ ha niile, ǹtu niile, ụdọ ha niile na ngwongwo ndị ọzọ e ji arụ ọrụ metụtara ihe ndị a ha ga-ebu. Kenye nwoke ọbụla ọrụ nke ya. Kpọ onye ahụ aha nye ya ọrụ nke ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.