15tinyere aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ na otu nkata achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, na achịcha e ji ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ oliv mee, na achịcha mbadamba na-ekoghị eko nke e tere mmanụ oliv.
16“ ‘Onye nchụaja ahụ ga-eche ihe aja ndị a niile nʼihu Onyenwe anyị, chụọ aja mmehie na aja nsure ọkụ.
17Ọ ga-eji nwa ebule ahụ chụọ aja udo nye Onyenwe anyị, ya na nkata achịcha na-ekoghị eko ahụ. Ọ ga-achụkwa aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ.
18“ ‘Mgbe ahụ, onye ahụ doro onwe ya nsọ nye Onyenwe anyị ga-akpụchapụ agịrị isi ya nke bụ ihe na-egosi ido nsọ ya. Ọ ga-eme nke a na mbata ọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ. Emesịa, ọ ga-etinye agịrị isi ahụ ọ kpụchapụtara nʼọkụ ahụ dị nʼokpuru aja udo ahụ.
19“ ‘Mgbe a kpụchasịrị onye ahụ agịrị isi ya, nke na-egosi ido nsọ ya, onye nchụaja ga-ewere ubu aka ebule ahụ e sịrị esi, otu ogbe achịcha na-ekoghị eko na otu mbadamba achịcha na-ekoghị eko site na nkata ahụ, tinye ha niile nʼaka onye ahụ.