38O wetara otu efere ọlaedo nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
39O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
40O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,
41ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Shelumiel nwa Zurishadai nyere.
42Nʼụbọchị nke isii, Eliasaf nwa Deuel onyendu ebo Gad butere onyinye nke ya.