Ọnụọgụgụ 8

“Ugbu a, site nʼetiti ụmụ Izrel, kpọpụta ụmụ Livayị, doo ha iche, mee ha ka ha dịrị ọcha.

Numbers 8:6 (UKJV) Take the Levites from among the children of Israel, and cleanse them.

4Otu a ka esi mee ihe ịdọba oriọna ahụ. Ọ bụ naanị ọlaedo ka e ji kpụọ iheọkụ ahụ, site nʼụkwụ ya ruo nʼokooko niile e ji chọọ ya mma. A kpụrụ iheọkụ ahụ nʼusoro dịka oyiyi Onyenwe anyị gosiri Mosis si dị.

5Mgbe ahụ Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,

6“Ugbu a, site nʼetiti ụmụ Izrel, kpọpụta ụmụ Livayị, doo ha iche, mee ha ka ha dịrị ọcha.

7Ime ka ha dị ọcha, lee ihe ị ga-eme. Fesa ha mmiri na-asachapụ mmehie. Hụkwa na ha kpụchapụrụ ajị niile dị ha nʼahụ, ma sachaa uwe ha. Si otu a mee ka ha bụrụ ndị dị ọcha.

8Gwa ha ka ha weta nwa oke ehi na onyinye mkpụrụ ọka, bụ ụtụ ọka a gwara mmanụ. Ha ga-ewetakwa nwa oke ehi ọzọ; ka ọ bụrụ ihe ha ji achụ aja mmehie.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.