Ọnụọgụgụ 9

Kama ha ga-eme ya nʼuhuruchi abalị iri na anọ nke ọnwa abụọ. Ha ga-eri nwa atụrụ ha, achịcha na-ekoghị eko, na ahịhịa ilu.

Numbers 9:11 (UKJV) The fourteenth day of the second month at even they shall keep it, and eat it with unleavened bread and bitter herbs.

9Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,

10“Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Ọ bụrụ na e nwee onye Izrel ọbụla nke merụrụ onwe ya nʼoge Mmemme Ngabiga site nʼịnọ ozu mmadụ nso, maọbụ site nʼịnọ nʼije, ha nwekwara ike iso mee Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị.

11Kama ha ga-eme ya nʼuhuruchi abalị iri na anọ nke ọnwa abụọ. Ha ga-eri nwa atụrụ ha, achịcha na-ekoghị eko, na ahịhịa ilu.

12Ha agaghị erifọ ihe ọbụla nʼime ya ruo chi ọbụbọ ụbọchị so ya. Ha agaghị agbaji ọkpụkpụ ọbụla nke nwa atụrụ ahụ. Mgbe ha mere Mmemme Ngabiga, ha ga-esorokwa ụzọ niile e si eme mmemme ahụ mee nke ha.

13Ma ọbụla nọ nʼọnọdụ ịdị ọcha, onye nke na-anọghị nʼije nʼoge Mmemme Ngabiga ma kpachapụrụ anya hapụ isoro ndị ọzọ nʼoge mmemme a, a ga-ewezuga ya site nʼetiti ụmụ Izrel niile, nʼihi na ọ jụrụ iwetara Onyenwe anyị onyinye nʼoge a kara aka. Onye dị otu a ga-ebu ahụhụ mmehie ya nʼisi ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.