Ọnụọgụgụ 9

Ma ọbụla nọ nʼọnọdụ ịdị ọcha, onye nke na-anọghị nʼije nʼoge Mmemme Ngabiga ma kpachapụrụ anya hapụ isoro ndị ọzọ nʼoge mmemme a, a ga-ewezuga ya site nʼetiti ụmụ Izrel niile, nʼihi na ọ jụrụ iwetara Onyenwe anyị onyinye nʼoge a kara aka. Onye dị otu a ga-ebu ahụhụ mmehie ya nʼisi ya.

Numbers 9:13 (UKJV) But the man that is clean, and is not in a journey, and forbears to keep the passover, even the same soul shall be cut off from among his people: because he brought not the offering of the LORD in his appointed season, that man shall bear his sin.

11Kama ha ga-eme ya nʼuhuruchi abalị iri na anọ nke ọnwa abụọ. Ha ga-eri nwa atụrụ ha, achịcha na-ekoghị eko, na ahịhịa ilu.

12Ha agaghị erifọ ihe ọbụla nʼime ya ruo chi ọbụbọ ụbọchị so ya. Ha agaghị agbaji ọkpụkpụ ọbụla nke nwa atụrụ ahụ. Mgbe ha mere Mmemme Ngabiga, ha ga-esorokwa ụzọ niile e si eme mmemme ahụ mee nke ha.

13Ma ọbụla nọ nʼọnọdụ ịdị ọcha, onye nke na-anọghị nʼije nʼoge Mmemme Ngabiga ma kpachapụrụ anya hapụ isoro ndị ọzọ nʼoge mmemme a, a ga-ewezuga ya site nʼetiti ụmụ Izrel niile, nʼihi na ọ jụrụ iwetara Onyenwe anyị onyinye nʼoge a kara aka. Onye dị otu a ga-ebu ahụhụ mmehie ya nʼisi ya.

14“ ‘Onye ọbịa bi nʼetiti unu chọrọ iso na Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị, ọ ga-eme ya nʼusoro dịka iwu na ụkpụrụ e nyere si dị. Unu ga-enwe otu iwu ahụ nye onye amụrụ nʼala na mbịarambịa.’ ”

15Nʼụbọchị ahụ e guzobere ụlọ nzute ahụ bụ ụlọ ikwu nke igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, igwe ojii kpuchiri ya. Site nʼuhuruchi ruo nʼụtụtụ igwe ojii ahụ dị nʼelu ụlọ nzute ahụ dịka ọkụ nʼile anya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.