15Nʼụbọchị ahụ e guzobere ụlọ nzute ahụ bụ ụlọ ikwu nke igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, igwe ojii kpuchiri ya. Site nʼuhuruchi ruo nʼụtụtụ igwe ojii ahụ dị nʼelu ụlọ nzute ahụ dịka ọkụ nʼile anya.
16Otu a ka ọ dịgidere mgbe niile. Igwe ojii kpuchigidere ya, ma nʼabalị ọ na-acha dị ka ọkụ.
17Mgbe ọ bụla igwe ojii ahụ si nʼelu ụlọ nzute ahụ bilie, ụmụ Izrel na-ebuli njem, ma mgbe ọbụla igwe ojii ahụ na-anọgide, ha na-anọgidekwa.
18Mgbe Onyenwe anyị nyekwara iwu, ha na-akwụsị, maa ụlọ ikwu ha. Oge niile igwe ojii nọgidere nʼelu ụlọ nzute ahụ ka ụmụ Izrel na-anọgidekwa nʼụlọ ikwu ha.
19Ọ bụrụ na igwe ojii ahụ anọọtee anya, ụmụ Izrel nʼonwe ha na-erube isi nʼiwu Onyenwe anyị hapụ ịga nʼihu nʼije ha.