16Otu a ka ọ dịgidere mgbe niile. Igwe ojii kpuchigidere ya, ma nʼabalị ọ na-acha dị ka ọkụ.
17Mgbe ọ bụla igwe ojii ahụ si nʼelu ụlọ nzute ahụ bilie, ụmụ Izrel na-ebuli njem, ma mgbe ọbụla igwe ojii ahụ na-anọgide, ha na-anọgidekwa.
18Mgbe Onyenwe anyị nyekwara iwu, ha na-akwụsị, maa ụlọ ikwu ha. Oge niile igwe ojii nọgidere nʼelu ụlọ nzute ahụ ka ụmụ Izrel na-anọgidekwa nʼụlọ ikwu ha.
19Ọ bụrụ na igwe ojii ahụ anọọtee anya, ụmụ Izrel nʼonwe ha na-erube isi nʼiwu Onyenwe anyị hapụ ịga nʼihu nʼije ha.
20Oge ụfọdụ, igwe ojii ahụ na-anọgide naanị abalị ole na ole. Dịka iwu Onyenwe anyị si dị, ha na-ama ụlọ ikwu ha, maọbụ bulie njem ha.