17Ma nʼugwu Zayọn ndị gbara ọsọ ndụ ga-afọdụ, ọ ga-adị nsọ, ụlọ Jekọb ga-enwetakwa ihe nketa ha ọzọ.
18Ụlọ Jekọb ga-abụ ọkụ, ụlọ Josef ga-abụkwa ire ọkụ: ma ụlọ Ịsọ ga-aghọkwa ukwu ọka. Ha ga-esunyekwa ha ọkụ ma rechapụ ya. Ọ dịkwaghị ndị ga-afọdụ ndụ site nʼụlọ Ịsọ.” Onyenwe anyị ekwuola ya.
19Mgbe ahụ, ndị bi na Negev ga-ebichi nʼugwu ugwu Ịsọ, ndị si na Shefela ga-enwekọta ala ndị Filistia. Ha ga-anọchi ala ubi niile nke ndị Ifrem na nke Sameria. Ndị Benjamin ga-enwetakwa Gilead.
20Ụmụ Izrel gbara ọsọ ndụ gaa na Hala, ga-enweta, bido nʼala Fonisia ruo Zarefat. Ndị ahụ e mere ka ha si Jerusalem gaa biri na Sefarad, ga-enwetakwa obodo niile nke Negeb.
21Ndị nnapụta ga-agbago nʼugwu Zayọn maka ịchị ugwu Ịsọ niile. Mgbe ahụ alaeze niile ga-abụkwa nke Onyenwe anyị.