3Nganga nke obi gị eduhiela gị, gị onye bi na mgbawa niile nke nkume dị elu, onye ebe obibi ya dị nʼebe dị oke elu. Gị onye na-ekwu nʼime obi ya, ‘Onye ga-akpụdata m nʼala?’
4A sịkwarị na i felie elu dịka ugo, ọ bụrụkwa na ị kpaa akwụ gị nʼetiti kpakpando, aga m esite nʼebe ahụ kpụdata gị nʼala.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
5“Ọ bụrụ na ndị ohi abịakwute gị, e, ọ bụrụ na ndị na-apụnara mmadụ ihe abịakwute gị nʼetiti abalị, lee, ụdị mbibi na-echere ịdakwasị gị! Ọ bụghị naanị ihe ha chọrọ ka ha ga-ezuru? Ọ bụrụ na ndị na-aghọ mkpụrụ vaịnị abịakwute gị, ọ bụ na ha agaghị ahapụrụ gị mkpụrụ ole na ole?
6Ma lee ka e si nyochapụtachaa ebe niile Ịsọ debere akụ ya, lekwaa ka e si chịkọrọ akụ ya niile bụ nke zoro ezo!
7Ndị enyi gị niile aghọgbuola gị, nwee ike imegide gị, ndị gị na ha na-adị na mma achụrụla gị ruo nʼoke ala; ndị gị na ha na-erikọ nri gị ga-esiri gị ọnya igbudu, ma ị gaghị achọpụta ya.