25Ebe nke a doro m anya, amara m na mụ na unu niile ga-aga nʼihu ịnọ maka ọganihu na ọṅụ nke unu nʼime okwukwe.
26Ka mgbe m ga-abịakwute unu ọzọ, unu ga-enwebiga ọṅụ oke nʼime Kraịst Jisọs nʼihi m.
27Ma nʼọnọdụ ọbụla, na-ebinụ ndụ kwesiri oziọma nke Kraịst, ma abịara m leta unu maọbụ na abịaghị m, ka a mata na unu guzosiri ike nʼotu mmụọ, werekwa otu obi na-agba mgba nʼokwukwe nke ikwusa oziọma,
28na-atụghị ụjọ ihe ndị na-emegide unu ga-eme. Iguzosi ike unu ga-agbara ha ezi ama banyere ịla nʼiyi nke ga-abịakwasị ha. Ma nʼebe unu nọ, ọ ga-abụrụ unu nzọpụta pụtara ihe nke sikwa nʼebe Chineke nọ bịa.
29Nʼihi na ohere ahụ e nyere unu, abụghị naanị ikwere na Kraịst, kama ọ bụkwa ịhụ ahụhụ nʼihi ya.