26Ugbu a, ana m eziteghachiri unu ya, nʼihi na ọ na-agụsị ya agụụ ike ịhụ unu anya. O wutekwara ya nke ukwuu, na e mere ka unu mara na ọ dara ọrịa nʼoge gara aga.
27Nʼezie, ọ fọdụrụ nnọọ ntakịrị ka o site nʼọrịa ahụ daa nʼụra ọnwụ. Ma Chineke meere ya ebere. Ọ bụghị naanị ya, kama o mekwaara m ebere, nʼihi na o kweghị ka a tụkwasịrị m ihe mwute nʼelu ihe mwute.
28Nʼihi nke a, ọ na-anụ m ọkụ nʼobi izite ya nʼebe unu nọ. Nʼihi na amaara m na ọbịbịa ọ ga-abịakwute unu ga-eme ka unu ṅụrịa ọṅụ. Ọ ga-emekwa ka ọnọdụ nchegbu m dị mfe.
29Ya mere, arịọ m unu, werenụ ọṅụ nabata ya nke ọma nʼime Onyenwe anyị, na-asọpụkwaranụ ndị dị ka ya.
30Nʼihi na ọ fọdụrụ nwantịị ka o nwụọ, nʼihi ọrụ nke Kraịst, tinye ndụ ya nʼihe egwu iji mezuo ọrụ unu nʼebe m nọ.