8Nwa m, na-aṅa ntị na ntụziaka nke nna gị ahapụkwala ndụmọdụ nne gị.
9Nʼihi na okpu amara ka ha ga-abụrụ isi gị, bụrụkwa ihe ịnya nʼolu nye gị.
10Nwa m, ọ bụrụ na ndị mmehie ara gị ụra, ekwenyerela ha, Ekwela!
11Ọ bụrụ na ha asị gị, “Bịa soro anyị; ka anyị zoo onwe anyị, tigbuo onye ọbụla anyị hụrụ, bụ onye na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla.
12Ka anyị loo ha na ndụ, dịka ala ili, loo ha kpamkpam dịka ndị na-arịda nʼolulu.