20Onyenwe anyị na-akpọ ndị obi ha gbagọrọ agbagọ asị ma ndị ụzọ ha na-enweghị ihe ịta ụta na-amasị ya.
21Ọ bụ ihe doro anya na ndị na-emebi iwu ga-ata ahụhụ, ma ndị ezi omume ka a ga-anapụta.
22Nwanyị mara mma, nke na-enweghị uche, dịka ọlaedo a gbanyere ezi nʼimi.
23Olileanya onye ezi omume bụ ọṅụ, ma onye na-emebi iwu na-ele naanị anya ihe ọjọọ.
24Otu onye na-agbasapụ aka ya na-enye enye ma na-enweta akụ karịa, ma onye ọzọ na-egbochi egbochi ma na-ada ogbenye.