27Onye na-achọ ihe ọma na-enweta ihuọma, ma ihe ọjọọ na-abịakwasị onye na-achọ ya.
28Ndị tụkwasịrị obi nʼakụnụba ha ga-ada, ma onye ezi omume ga-epupụta dịka akwụkwọ ndụ.
29Onye na-ewetara ezinaụlọ ha nsogbu ga-eketa naanị ifufe, onye nzuzu ga-abụ ohu nke onye maara ihe.
30Mkpụrụ nke ndị ezi omume bụ osisi na-enye ndụ, onye na-erita mkpụrụobi nʼuru bụ onye maara ihe.
31Ọ bụrụ na a ga-akwụ ndị ezi omume ụgwọ ọrụ ha nʼụwa a; a ga-esi aṅaa ghara ịkwụ ndị na-amaghị Chineke na ndị mmehie ụgwọ ọrụ.