9Ọ ka mma ịbụ onye a na-elelị anya ma i nwere ohu, karịa ịbụ onye a na-asọpụrụ ma bụrụ onye nri na-adịghị nʼụlọ ya.
10Onye ezi omume na-elekọta anụ ụlọ ya, ma obi ebere kachasị nro nke onye ajọ omume mere bụ enweghị obi ebere.
11Onye na-arụ ala ubi ya ga-enwe nri nʼebe ọ bara ụba, ma onye na-agbaso ihe efu dị iche iche, amamihe kọrọ.
12Ndị ajọ omume na-enwekwa anya ukwu nʼihe ndị ajọ omume ibe ha nwere, ma mgbọrọgwụ nke ndị ezi omume ga-eto eto.
13A na-ejide onye ajọ omume site nʼokwu ọnụ ya, ma onye ezi omume na-esi na nsogbu wezuga onwe ya.