12Ndị ajọ omume na-enwekwa anya ukwu nʼihe ndị ajọ omume ibe ha nwere, ma mgbọrọgwụ nke ndị ezi omume ga-eto eto.
13A na-ejide onye ajọ omume site nʼokwu ọnụ ya, ma onye ezi omume na-esi na nsogbu wezuga onwe ya.
14Ikwu eziokwu na-enye mmadụ obi ụtọ, inwe mgbalị na-ewetara ya ngọzị.
15Ụzọ ndị nzuzu nʼuche ha onwe ha ziri ezi, ma onye maara ihe na-aṅa ntị nye ndụmọdụ.
16Ndị nzuzu na-egosipụta iwe ha ọsịịsọ, ma onye nwere uche na-elepụrụ mkparị anya.