15Ụzọ ndị nzuzu nʼuche ha onwe ha ziri ezi, ma onye maara ihe na-aṅa ntị nye ndụmọdụ.
16Ndị nzuzu na-egosipụta iwe ha ọsịịsọ, ma onye nwere uche na-elepụrụ mkparị anya.
17Ezi onye akaebe na-ekwu eziokwu, ma ajọ onye akaebe na-ekwu okwu ụgha.
18Okwu ọjọọ na-agbawa obi dịka mma agha, ma ire onye maara ihe na-eweta ọgwụgwọ.
19Eziokwu na-eguzo ruo mgbe ebighị ebi, ma okwu ụgha anaghị adịgide.