17Ezi onye akaebe na-ekwu eziokwu, ma ajọ onye akaebe na-ekwu okwu ụgha.
18Okwu ọjọọ na-agbawa obi dịka mma agha, ma ire onye maara ihe na-eweta ọgwụgwọ.
19Eziokwu na-eguzo ruo mgbe ebighị ebi, ma okwu ụgha anaghị adịgide.
20Aghụghọ na-ejupụta nʼobi na-eche ihe ọjọọ; ma ndị na-eme ka udo dị na-enwe ọṅụ.
21Ihe ọjọọ anaghị adakwasị onye ezi omume, ma ndị ajọ omume enwetala nsogbu ebe ọ dị ukwuu.