19Eziokwu na-eguzo ruo mgbe ebighị ebi, ma okwu ụgha anaghị adịgide.
20Aghụghọ na-ejupụta nʼobi na-eche ihe ọjọọ; ma ndị na-eme ka udo dị na-enwe ọṅụ.
21Ihe ọjọọ anaghị adakwasị onye ezi omume, ma ndị ajọ omume enwetala nsogbu ebe ọ dị ukwuu.
22Onyenwe anyị kpọrọ egbugbere ọnụ nʼagha ụgha asị, ma ihe ndị kwesiri ntụkwasị obi na-amasị ya.
23Onye nwere uche na-edebe ihe ọmụma ha nye onwe ha, ma onye nzuzu na-agbasa enweghị uche ya nʼanwụ.