20Aghụghọ na-ejupụta nʼobi na-eche ihe ọjọọ; ma ndị na-eme ka udo dị na-enwe ọṅụ.
21Ihe ọjọọ anaghị adakwasị onye ezi omume, ma ndị ajọ omume enwetala nsogbu ebe ọ dị ukwuu.
22Onyenwe anyị kpọrọ egbugbere ọnụ nʼagha ụgha asị, ma ihe ndị kwesiri ntụkwasị obi na-amasị ya.
23Onye nwere uche na-edebe ihe ọmụma ha nye onwe ha, ma onye nzuzu na-agbasa enweghị uche ya nʼanwụ.
24Aka na-arụsị ọrụ ike ga-achị achị, ma umengwụ ga-akwụsị naanị nʼọrụ mmanye.