Ilu 12

Ezi mmadụ na-anata ihuọma site nʼaka Onyenwe anyị, ma onye na-atụpụta atụmatụ ọjọọ ka ọ na-ama ikpe.

Proverbs 12:2 (UKJV) A good man obtains favour of the LORD: but a man of wicked devices will he condemn.

1Onye ọbụla na-ahụ ịdọ aka na ntị nʼanya na-ahụ ihe ọmụma nʼanya, ma onye na-akpọ ịba mba asị bụ onye na-enweghị ụbụrụ isi.

2Ezi mmadụ na-anata ihuọma site nʼaka Onyenwe anyị, ma onye na-atụpụta atụmatụ ọjọọ ka ọ na-ama ikpe.

3Onye ajọ omume agaghị anọgide, ma apụghị ihopu onye ezi omume.

4Ezi nwanyị bụ ọṅụ na okpueze di ya, ma nwanyị na-eweta ihere dịka ire ure nʼọkpụkpụ di ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.