23Onye nwere uche na-edebe ihe ọmụma ha nye onwe ha, ma onye nzuzu na-agbasa enweghị uche ya nʼanwụ.
24Aka na-arụsị ọrụ ike ga-achị achị, ma umengwụ ga-akwụsị naanị nʼọrụ mmanye.
25Obi nke jupụtara na nchegbu na-ada mba, ma okwu ọma na-eme ka obi ṅụrịa.
26Onye ezi omume na-eduzi onye agbataobi ya, ma onye na-emebi iwu na-eduhie ha.
27Onye umengwụ adịghị ahụ anụ ọ chụtara na nta nʼọkụ, ma ndị na-arụsị ọrụ ike na-eri site nʼakụ ha nwetara nʼịchụ nta.