Ilu 12

Echiche obi niile nke onye ezi omume bụ ihe ziri ezi, ma ndụmọdụ onye ajọ omume jupụtara nʼaghụghọ.

Proverbs 12:5 (UKJV) The thoughts of the righteous are right: but the counsels of the wicked are deceit.

3Onye ajọ omume agaghị anọgide, ma apụghị ihopu onye ezi omume.

4Ezi nwanyị bụ ọṅụ na okpueze di ya, ma nwanyị na-eweta ihere dịka ire ure nʼọkpụkpụ di ya.

5Echiche obi niile nke onye ezi omume bụ ihe ziri ezi, ma ndụmọdụ onye ajọ omume jupụtara nʼaghụghọ.

6Okwu niile nke ndị ajọ omume bụ ihe na-eweta ọnwụ, ma okwu ndị omume ha ziri ezi na-anapụta ha.

7Ndị na-emebi iwu ga-ala nʼiyi, ma ndị ezi omume ga-eguzosi ike.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.