Ilu 12

Ndị na-emebi iwu ga-ala nʼiyi, ma ndị ezi omume ga-eguzosi ike.

Proverbs 12:7 (UKJV) The wicked are overthrown, and are not: but the house of the righteous shall stand.

5Echiche obi niile nke onye ezi omume bụ ihe ziri ezi, ma ndụmọdụ onye ajọ omume jupụtara nʼaghụghọ.

6Okwu niile nke ndị ajọ omume bụ ihe na-eweta ọnwụ, ma okwu ndị omume ha ziri ezi na-anapụta ha.

7Ndị na-emebi iwu ga-ala nʼiyi, ma ndị ezi omume ga-eguzosi ike.

8Onye nwere uche zuruoke ka mmadụ niile na-achọ, ma onye uche ya gbagọrọ agbagọ ka mmadụ na-eleda anya.

9Ọ ka mma ịbụ onye a na-elelị anya ma i nwere ohu, karịa ịbụ onye a na-asọpụrụ ma bụrụ onye nri na-adịghị nʼụlọ ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.