12Nchere a na-echere ogologo oge maka imezu olileanya e nwere na-egbu obi, mgbe ihe a na-eche mezuru, oke ọṅụ na-adị.
13Onye na-elelị ntụziaka anya ga-akwụ ụgwọ nʼihi ya, ma onye na-atụ egwu ihe enyere nʼiwu ga-anata ụgwọ ọrụ ya.
14Nkuzi nke onye maara ihe bụ isi iyi nke ndụ, nke na-eme ka mmadụ ghara ịma nʼọnya ọnwụ.
15Ezi nghọta na-eweta ihuọma, ma ụzọ nke ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi na-eduba ha na mbibi.
16Onye nwere uche na-eji ọmụma ihe nʼarụ ọrụ, ma ndị nzuzu na-egosipụta enweghị uche ya.