13Onye na-elelị ntụziaka anya ga-akwụ ụgwọ nʼihi ya, ma onye na-atụ egwu ihe enyere nʼiwu ga-anata ụgwọ ọrụ ya.
14Nkuzi nke onye maara ihe bụ isi iyi nke ndụ, nke na-eme ka mmadụ ghara ịma nʼọnya ọnwụ.
15Ezi nghọta na-eweta ihuọma, ma ụzọ nke ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi na-eduba ha na mbibi.
16Onye nwere uche na-eji ọmụma ihe nʼarụ ọrụ, ma ndị nzuzu na-egosipụta enweghị uche ya.
17Onyeozi ajọ omume na-adaba na nsogbu, ma onyeozi kwesiri ntụkwasị obi na-eweta ọgwụgwọ.