3Mmadụ zuruoke bụ onye na-ejide ire ya aka! Ma onye ekwuruekwu na-ewetara onwe ya mbibi.
4Ndị umengwụ na-achọ ọtụtụ ihe ma ọ dịghị ihe ha na-enweta; ma onye na-arụsị ọrụ ike na-enweta ihe niile ọ chọrọ.
5Onye ezi omume kpọrọ ụgha asị, ma okwu ọnụ onye na-emebi iwu na-ewetara ya ihere na nkọcha.
6Ezi omume mmadụ na-abara ya uru na ndụ ya niile, ma ajọ omume ndị mmehie na-ala ha nʼiyi.
7Ọ dị mmadụ na-eme ka ọ bụ ọgaranya maọbụ onye ụkpa. Ma ọ dịkwa mmadụ na-eme ka ọ bụ onye ụkpa maọbụ ọgaranya.