1Nwa maara ihe na-ege ntị na ndụmọdụ nna ya ma onye na-akwa emo adịghị ege ntị nʼịba mba.
2Onye na-eme ezi ihe ga-esite nʼokwu ọnụ ya nweta ụgwọ ọrụ, ma ndị na-aghọgbu ibe ha ga-anata ihe ike dịka ụgwọ ọrụ ha.
3Mmadụ zuruoke bụ onye na-ejide ire ya aka! Ma onye ekwuruekwu na-ewetara onwe ya mbibi.
4Ndị umengwụ na-achọ ọtụtụ ihe ma ọ dịghị ihe ha na-enweta; ma onye na-arụsị ọrụ ike na-enweta ihe niile ọ chọrọ.
5Onye ezi omume kpọrọ ụgha asị, ma okwu ọnụ onye na-emebi iwu na-ewetara ya ihere na nkọcha.