15Mgbe ọchị dị nʼihu eze ọ na-ewetara onye hụrụ ya ndụ, ihuọma ya dị ka igwe ojii na-eweta mmiri ozuzo.
16Ọ ka mma inwe amamihe na mmụọ ịghọta ihe karịa inwe ọlaọcha na ọlaedo.
17Ụzọ dị larịị nke onye ziri ezi bụ iwezuga onwe ya pụọ nʼihe ọjọọ, ndị na-echebe ụzọ ha niile na-echebekwa ndụ ha.
18Nganga na-eweta ịla nʼiyi, mpako na-ewetakwa ọdịda.
19Ọ ka mma ịbụ onye ogbenye nwere obi umeala karịa ịbụ onye nganga, na onye so ndị nganga keta oke nʼihe ha kwatara nʼagha.