25Ọ dị ụzọ nke ziri ezi nʼanya mmadụ, ma nʼikpeazụ ọ na-eduba nʼọnwụ.
26Agụụ ihe oriri nke onye ọrụ na-arụpụtara ya ọrụ; agụụ na-akpali mmụọ ya ịga nʼihu.
27Ndị ọjọọ na-atụpụta echiche ọjọọ, egbugbere ọnụ ha dị ka ọkụ nke na-ekpochapụ ahụ.
28Onye na-emebi iwu na-agbasa ise okwu; ha na-akpali nsogbu, na-ekewa enyi na enyi.
29Ndị ọjọọ na-arafu ndị agbataobi ha, na-edubakwa ha nʼụzọ ga-ewetara ha mbibi.