23Obi onye maara ihe na-eme ka e tinye uche nʼokwu ọnụ ya, egbugbere ọnụ ha na-emekwa ka mmụta gaa nʼihu.
24Okwu dị nro na-atọ ụtọ ka mmanụ aṅụ, ọ na-atọ mkpụrụobi ụtọ, na-enyekwa ọkpụkpụ ahụ ike.
25Ọ dị ụzọ nke ziri ezi nʼanya mmadụ, ma nʼikpeazụ ọ na-eduba nʼọnwụ.
26Agụụ ihe oriri nke onye ọrụ na-arụpụtara ya ọrụ; agụụ na-akpali mmụọ ya ịga nʼihu.
27Ndị ọjọọ na-atụpụta echiche ọjọọ, egbugbere ọnụ ha dị ka ọkụ nke na-ekpochapụ ahụ.