30Onye ji ikuanya ya ekwu okwu na-atụ atụmatụ ọjọọ, onye na-atabi egbugbere ọnụ ya abụọ ekpebiela ime mmehie.
31Isi awọ bụ okpueze nke mara mma, a na-enweta ya nʼụzọ ezi omume.
32Onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ karịrị onye a maara aha ya. Onye nwere ogologo ntachiobi karịrị onye na-adọta obodo nʼagha.
33A na-efe nza, nʼihi ịchọpụta uche Onyenwe anyị, maọbụ Chineke nʼonwe ya na-ekpebi ihe a ga-efeta na nza ahụ.