11Ezi uche mmadụ nwere na-amụpụta ndidi; ọ bụkwa nkwanye ugwu nye onye nʼadịghị agụ mkparị a na-akparị ya.
12Iwe eze dị ka mbigbọ nke ọdụm. Ma obi ụtọ ya dị ka igirigi nʼelu ahịhịa ndụ.
13Nwa nzuzu bụ ịla nʼiyi nke nna, nwunye na-ese okwu dị ka mmiri ọtụtụ na-atụ kpọm, kpọm, mgbe niile nʼelu ụlọ puru epu.
14Ụlọ dị iche iche na akụ bụ ihe nketa a na-anata nʼaka ndị nne na nna, ma nwunye nwere uche na nghọta na-esite naanị nʼaka Onyenwe anyị.
15Umengwụ na-akpata oke ịrahụ ụra, onye ọfọ ogori ka agụụ na-agụ.