1Ọ ka mma ịbụ ogbenye onye kwesiri ntụkwasị obi karịa ịbụ onye nzuzu na-ekwu okwu ụgha mgbe niile.
2Arịrịọ nke na-enweghị ihe ọmụma adịghị mma otu a kwa onye ụkwụ ya na-eme ngwa na-ejehie ụzọ.
3Enweghị uche nke mmadụ na-eduba ha nʼọghọm, ma obi ha na-ewe iwe dị ukwuu megide Onyenwe anyị.
4Onye nwere ego na-enwe ọtụtụ ndị enyi, ma ọ na-ara ahụ ka ndị enyi onye ogbenye nọgide.
5Onye na-agba ama ụgha ga-ata ahụhụ, ụzọ onye na-ekupụ ụgha dịka ume ka a ga-achọpụtakwa.