4Onye nwere ego na-enwe ọtụtụ ndị enyi, ma ọ na-ara ahụ ka ndị enyi onye ogbenye nọgide.
5Onye na-agba ama ụgha ga-ata ahụhụ, ụzọ onye na-ekupụ ụgha dịka ume ka a ga-achọpụtakwa.
6Ọtụtụ mmadụ na-achọ ihuọma nʼebe onye na-achị achị nọ, otu a kwa, mmadụ niile na-agbalị ịbụ enyi onye na-agbasa aka ya na-enye onyinye.
7Ebe ọ bụ na ụmụnne onye ogbenye na-akpọ ya asị, gịnịkwa ka ndị enyi ya ga-eme? Mgbalị ya niile ịrịọ ha arịrịọ ezughị ime ka ha nọgide.
8Onye na-enweta amamihe hụrụ ndụ nʼanya, onye na-edebekwa nghọta na-enweta ọganihu.