7Ebe ọ bụ na ụmụnne onye ogbenye na-akpọ ya asị, gịnịkwa ka ndị enyi ya ga-eme? Mgbalị ya niile ịrịọ ha arịrịọ ezughị ime ka ha nọgide.
8Onye na-enweta amamihe hụrụ ndụ nʼanya, onye na-edebekwa nghọta na-enweta ọganihu.
9Onyeama ụgha aghaghị ịta ahụhụ, onye ọbụla na-ekwupụ okwu ụgha dịka mmiri ga-ala nʼiyi.
10Onye nzuzu ekwesighị ibi dịka ọgaranya; ohu ekwesịkwaghị ịchị ụmụ eze.
11Ezi uche mmadụ nwere na-amụpụta ndidi; ọ bụkwa nkwanye ugwu nye onye nʼadịghị agụ mkparị a na-akparị ya.