8Ọ na-echebekwa ụzọ nke ndị na-eme ezi ihe na-agbaso, na-elekọtakwa ụzọ nke ndị hụrụ ya nʼanya na-agbaso.
9Mgbe ahụ ka ị ga-aghọta ihe ziri ezi na ihe dị mma na ezi ụzọ niile.
10Nʼihi na amamihe ga-enwe ọnọdụ nʼime obi gị, ihe ọmụma ga-adịkwa mkpụrụobi gị ụtọ.
11Izuzu zuruoke ga-echebe gị, nghọta ga na-eche gị nche.
12Amamihe ga-azọpụta gị site nʼụzọ ndị mmehie, sitekwa na mmadụ ndị okwu ha jọrọ njọ,