6Nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị na-enye amamihe; nʼebe ọ nọ ka nghọta na ihe ọmụma na-esi abịa.
7Ọ na-edebere ndị ụzọ ha ziri ezi nzube ọganihu, ọ bụ ọta nye ndị na-eje ije nʼizuoke.
8Ọ na-echebekwa ụzọ nke ndị na-eme ezi ihe na-agbaso, na-elekọtakwa ụzọ nke ndị hụrụ ya nʼanya na-agbaso.
9Mgbe ahụ ka ị ga-aghọta ihe ziri ezi na ihe dị mma na ezi ụzọ niile.
10Nʼihi na amamihe ga-enwe ọnọdụ nʼime obi gị, ihe ọmụma ga-adịkwa mkpụrụobi gị ụtọ.