12Amamihe ga-azọpụta gị site nʼụzọ ndị mmehie, sitekwa na mmadụ ndị okwu ha jọrọ njọ,
13ndị hapụrụ ụzọ niile ziri ezi nke Chineke na-agbaso ụzọ niile nke ọchịchịrị,
14ndị na-aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ, nʼihi na mmehie ha na-atọ ha ụtọ.
15Ihe ọbụla ha na-eme gbagọrọ agbagọ, jọọkwa njọ.
16Ọ bụ naanị amamihe ga-anapụta gị nʼaka nwanyị akwụna, na nwanyị na-abụghị nwunye gị nke na-ekwu okwu nrafu.