14ndị na-aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ, nʼihi na mmehie ha na-atọ ha ụtọ.
15Ihe ọbụla ha na-eme gbagọrọ agbagọ, jọọkwa njọ.
16Ọ bụ naanị amamihe ga-anapụta gị nʼaka nwanyị akwụna, na nwanyị na-abụghị nwunye gị nke na-ekwu okwu nrafu.
17Onye na-ahapụ di ọ lụrụ nʼagbọghọ, nke chefuru ọgbụgba ndụ ọ gbara nʼihu Chineke.
18Ụlọ nwanyị dị otu a dị nʼokporoụzọ nke na-eduba nʼọnwụ na nʼọkụ ala mmụọ.