16Mkpụrụobi m ga-aṅụrị ọṅụ mgbe egbugbere ọnụ gị abụọ kwuru ihe ziri ezi.
17Ekwela ka obi gị kwosa ndị mmehie ekworo, kama nọgide nʼịnụ ọkụ nʼobi nʼịtụ egwu Onyenwe anyị mgbe niile,
18nʼihi na i nwere ọtụtụ ihe ọma nʼihu gị. Olileanya dị ukwuu dịrị gị.
19Nwa m, nwee uche, gbasookwa ụzọ Chineke.
20Anọla nʼetiti ndị na-aṅụbiga mmanya oke, na ndị iri oke oriri na-atọ ụtọ,